Leviticus 16

Ụbọchị mkpuchi mmehie

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu mgbe ụmụ ndị ikom Erọn abụọ ndị ahụ bịara nʼihu Onyenwe anyị nwụsịrị. 2Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ.

3“Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, 4Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha,
Ndị nchụaja na-eyipụ uwe ije ozi ha, hapụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, mgbe ha jesiri ozi. Izk 44:17-19
ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha.
5Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ Izrel nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ.

6“Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya. 7Emesịa, ọ ga-ewere mkpi abụọ ndị ahụ chee ha nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 8Ọ ga-efe nza nʼisi mkpi abụọ ahụ, ịchọpụta nke dịrị Onyenwe anyị nke ọzọ abụrụ nke ọ ga-ahapụ. 9Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke Onyenwe anyị, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie. 10Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara.

11“Erọn ga-eweta oke ehi maka aja mmehie nke ya onwe ya, iji kpuchie mmehie ya na nke ezinaụlọ ya. Ọ ga-egbu oke ehi ahụ maka aja mmehie nke ya onwe ya. 12Ọ ga-esite nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị were ihe ịgụ ọkụ jupụtara nʼicheku ọkụ. Ọ ga-ewerekwa ụda na-esi isi ụtọ ruru mkpoju aka abụọ, were ha bata nʼime akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ. 13Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu Ihe Ama ahụ ka ọ ghara ịnwụ. 14Ọ ga-ewebatakwa ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ, jiri mkpịsịaka ya fesa ya nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, fesakwa ya ugboro asaa nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ.

15“Emesịa, ọ ga-esi nʼebe ahụ pụọ gaa gbuo mkpi aja mmehie ụmụ Izrel, werekwa ọbara ya bata nʼazụ akwa mgbochi fesa ya nʼelu ebe mkpuchi mmehie ahụ, na nʼihu ya, dịka o jiri ọbara nwa oke ehi ahụ mee. 16Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel. 17O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile.

18“Mgbe o si nʼebe ahụ pụta, gaa nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ewere ụfọdụ ọbara nwa oke ehi ahụ na nke mkpi ahụ tee ya na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja ahụ. 19Ọ ga-eji mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ ọbara ahụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ ugboro asaa iji hichapụ adịghị ọcha ya nʼihi ịrụ arụ ụmụ Izrel, na ido ya nsọ.

20“Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka Ebe ahụ Kachasị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ. 21Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ Izrel niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a. 22Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara.

23“Mgbe ahụ, Erọn ga-aba nʼime ụlọ nzute ahụ, b yipụ uwe akwa ọcha ndị nchụaja ahụ niile o yi nʼahụ ya tupu ọ banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-awụsa ha nʼebe ahụ. 24Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha. 25Ọ ga-akpọkwa abụba anụ e ji chụọ aja mmehie ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

26“Mgbe nwoke ahụ kpụgara mkpi ahụ nʼọzara hapụ ya, lọtara, ọ ga-asa ahụ ya na uwe ya tupu ọ laghachi nʼime obodo. 27Oke ehi nakwa mkpi maka ịchụ aja mmehie ahụ, bụ nke ewebatara ọbara ha nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, maka ikpuchi mmehie, ka aghaghị ibupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu; a ga-akpọ akpụkpọ ha, anụ ahụ ha na mgbịrị afọ ha niile ọkụ. 28Onye ga-akpọ ha ọkụ ga-asa uwe ya, saakwa ahụ ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.

29“Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ ebighị ebi. Nʼafọ ọbụla, unu ga-ebu ọnụ, hapụ ịrụ ọrụ ọbụla, nʼụbọchị iri nke ọnwa asaa. Iwu a dịrị nwa afọ ala maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu. 30Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu Onyenwe anyị. 31Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe! 32Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ. 33Ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ na ụlọ nzute, ebe ịchụ aja na ndị nchụaja, na mkpokọta ndị obodo niile mmehie ha.

34“Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị Izrel niile.”

E mezuru ihe ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.

Copyright information for IboBIU